Izikiel 28:6
Ezekiel 28:6 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
“ ‘Ya mere, nke a bụ ihe Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị na-ekwu; “ ‘ebe ọ bụ na ị gụrụ onwe gị dịka onye maara ihe onye maara ihe dịka chi,
Ezekiel 28:6 in English
Ezekiel 28:6 · Berean Standard Bible
Therefore this is what the Lord GOD says: Because you regard your heart as the heart of a god,
Context
4I werela amamihe gị na nghọta gị
nwetara onwe gị akụ,
tụkọba ọlaedo na ọlaọcha,
nʼime ụlọakụ gị dị iche iche. 5E, mmụta nʼịzụ ahịa gị
emeela ka ị ghọọ ọgaranya,
nʼihi akụnụba inwere
ị bụrụla onye na-akpa nganga. 6“ ‘Ya mere, nke a bụ ihe Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị na-ekwu;
“ ‘ebe ọ bụ na ị gụrụ onwe gị dịka onye maara ihe
onye maara ihe dịka chi, 7ana m aga ịkpọbata ndị mba ọzọ megide gị,
bụ mba kachasị mba niile dị iche iche njọ na-enweghị obi ebere.
Ha ga-amịpụta mma agha ha megide ịma mma gị na amamihe gị,
ha ga-adụwakwa ebube nke mma gị. 8Ha ga-eme ka ị rịdaruo nʼolulu nke ala mmụọ.
Ị ga-anwụ ọnwụ ike
nʼetiti oke osimiri niile.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.