Native Bible

Ezekiel 28:7 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

ana m aga ịkpọbata ndị mba ọzọ megide gị, bụ mba kachasị mba niile dị iche iche njọ na-enweghị obi ebere. Ha ga-amịpụta mma agha ha megide ịma mma gị na amamihe gị, ha ga-adụwakwa ebube nke mma gị.

Ezekiel 28:7 in English

Ezekiel 28:7 · Berean Standard Bible

behold, I will bring foreigners against you, the most ruthless of nations. They will draw their swords against the beauty of your wisdom and will defile your splendor.

Context

5E, mmụta nʼịzụ ahịa gị emeela ka ị ghọọ ọgaranya, nʼihi akụnụba inwere ị bụrụla onye na-akpa nganga. 6“ ‘Ya mere, nke a bụ ihe Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị na-ekwu; “ ‘ebe ọ bụ na ị gụrụ onwe gị dịka onye maara ihe onye maara ihe dịka chi, 7ana m aga ịkpọbata ndị mba ọzọ megide gị, bụ mba kachasị mba niile dị iche iche njọ na-enweghị obi ebere. Ha ga-amịpụta mma agha ha megide ịma mma gị na amamihe gị, ha ga-adụwakwa ebube nke mma gị. 8Ha ga-eme ka ị rịdaruo nʼolulu nke ala mmụọ. Ị ga-anwụ ọnwụ ike nʼetiti oke osimiri niile. 9Mgbe nke a mere, ị ga-asị, “Mụ onwe m bụ chi,” nʼihu ndị ahụ na-egbu gị? Ma gị onwe gị bụ mmadụ efu, ị bụghị chi, nʼaka ndị ahụ na-egbu gị.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.