Izikiel 28:23
Ezekiel 28:23 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Aga m ezite ajọ ọrịa na-efe efe, nke ga-emegide ya, meekwa ka ọbara jupụta nʼokporoụzọ ya niile. Ndị e gburu egbu ga-ada nʼime ya, site na mma agha nke ga-abịakwasị ya nʼakụkụ niile. Mgbe ahụ, ha ga-amata na mụ onwe m bụ Onyenwe anyị.
Ezekiel 28:23 in English
Ezekiel 28:23 · Berean Standard Bible
I will send a plague against her and shed blood in her streets; the slain will fall within her, while the sword is against her on every side. Then they will know that I am the LORD.
Context
21“Nwa nke mmadụ, chee ihu nʼebe Saịdọn dị buo amụma megide ya, 22ma kwuo, ‘Ihe ndị a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwuru,
“ ‘Mụ onwe m na-emegide gị, gị Saịdọn,
nʼetiti unu ka m ga-egosipụta otuto m.
Unu ga-amata na mụ onwe m bụ Onyenwe anyị
mgbe m mere ka ahụhụ dakwasị unu,
nʼime unu, a ga-anwapụta na m bụ onye dị nsọ. 23Aga m ezite ajọ ọrịa na-efe efe, nke ga-emegide ya,
meekwa ka ọbara jupụta nʼokporoụzọ ya niile.
Ndị e gburu egbu ga-ada nʼime ya,
site na mma agha nke ga-abịakwasị ya nʼakụkụ niile.
Mgbe ahụ, ha ga-amata na mụ onwe m bụ Onyenwe anyị. 24“ ‘Ụlọ Izrel agaghị enwekwa mba kpọrọ ha asị gbara ha gburugburu ndị dịka uke, nke na-adụ adụ, na ogwu nke na-egbu mgbu. Ha ga-amatakwa na mụ onwe m bụ Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị. 25“ ‘Ihe ndị a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwuru: Ndị Izrel ga-alọghachi biri nʼala nke aka ha ọzọ, ala nke m nyere nna ha Jekọb ohu m. Nʼihi na aga m esite na mba niile ha gbasasịrị chịkọtaa ha, si otu a gosi mba niile nke ụwa ịdị nsọ m.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.