Izikiel 28:24
Ezekiel 28:24 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
“ ‘Ụlọ Izrel agaghị enwekwa mba kpọrọ ha asị gbara ha gburugburu ndị dịka uke, nke na-adụ adụ, na ogwu nke na-egbu mgbu. Ha ga-amatakwa na mụ onwe m bụ Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị.
Ezekiel 28:24 in English
Ezekiel 28:24 · Berean Standard Bible
For the people of Israel will no longer face a pricking brier or a painful thorn from all around them who treat them with contempt. Then they will know that I am the Lord GOD.’
Context
22ma kwuo, ‘Ihe ndị a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwuru,
“ ‘Mụ onwe m na-emegide gị, gị Saịdọn,
nʼetiti unu ka m ga-egosipụta otuto m.
Unu ga-amata na mụ onwe m bụ Onyenwe anyị
mgbe m mere ka ahụhụ dakwasị unu,
nʼime unu, a ga-anwapụta na m bụ onye dị nsọ. 23Aga m ezite ajọ ọrịa na-efe efe, nke ga-emegide ya,
meekwa ka ọbara jupụta nʼokporoụzọ ya niile.
Ndị e gburu egbu ga-ada nʼime ya,
site na mma agha nke ga-abịakwasị ya nʼakụkụ niile.
Mgbe ahụ, ha ga-amata na mụ onwe m bụ Onyenwe anyị. 24“ ‘Ụlọ Izrel agaghị enwekwa mba kpọrọ ha asị gbara ha gburugburu ndị dịka uke, nke na-adụ adụ, na ogwu nke na-egbu mgbu. Ha ga-amatakwa na mụ onwe m bụ Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị. 25“ ‘Ihe ndị a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwuru: Ndị Izrel ga-alọghachi biri nʼala nke aka ha ọzọ, ala nke m nyere nna ha Jekọb ohu m. Nʼihi na aga m esite na mba niile ha gbasasịrị chịkọtaa ha, si otu a gosi mba niile nke ụwa ịdị nsọ m. 26Ha ga-ebi nʼala a na ntụkwasị obi. Ha ga-ewu ụlọ, kụọ ubi vaịnị, birikwa na-atụghị egwu ọbụla. Mgbe m pịachara mba niile dị ha gburugburu ụtarị, bụ mba ndị ahụ mekpara ha ahụ, mgbe ahụ, ha ga-amata nʼezie na mụ onwe m bụ Onyenwe anyị Chineke ha.’ ”
28:2 Maọbụ, Chineke
28:2 Maọbụ, Chineke
28:13 Maọbụ, kanelien
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.