Native Bible

Ezekiel 28:22 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

ma kwuo, ‘Ihe ndị a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwuru, “ ‘Mụ onwe m na-emegide gị, gị Saịdọn, nʼetiti unu ka m ga-egosipụta otuto m. Unu ga-amata na mụ onwe m bụ Onyenwe anyị mgbe m mere ka ahụhụ dakwasị unu, nʼime unu, a ga-anwapụta na m bụ onye dị nsọ.

Ezekiel 28:22 in English

Ezekiel 28:22 · Berean Standard Bible

And you are to declare that this is what the Lord GOD says: ‘Behold, I am against you, O Sidon, and I will be glorified within you. They will know that I am the LORD when I execute judgments against her and demonstrate My holiness through her.

Context

20Okwu Onyenwe anyị ruru m ntị, sị, 21“Nwa nke mmadụ, chee ihu nʼebe Saịdọn dị buo amụma megide ya, 22ma kwuo, ‘Ihe ndị a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwuru, “ ‘Mụ onwe m na-emegide gị, gị Saịdọn, nʼetiti unu ka m ga-egosipụta otuto m. Unu ga-amata na mụ onwe m bụ Onyenwe anyị mgbe m mere ka ahụhụ dakwasị unu, nʼime unu, a ga-anwapụta na m bụ onye dị nsọ. 23Aga m ezite ajọ ọrịa na-efe efe, nke ga-emegide ya, meekwa ka ọbara jupụta nʼokporoụzọ ya niile. Ndị e gburu egbu ga-ada nʼime ya, site na mma agha nke ga-abịakwasị ya nʼakụkụ niile. Mgbe ahụ, ha ga-amata na mụ onwe m bụ Onyenwe anyị. 24“ ‘Ụlọ Izrel agaghị enwekwa mba kpọrọ ha asị gbara ha gburugburu ndị dịka uke, nke na-adụ adụ, na ogwu nke na-egbu mgbu. Ha ga-amatakwa na mụ onwe m bụ Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.