Izikiel 28:20
Ezekiel 28:20 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Okwu Onyenwe anyị ruru m ntị, sị,
Ezekiel 28:20 in English
Ezekiel 28:20 · Berean Standard Bible
Then the word of the LORD came to me, saying,
Context
18Nʼihi ọtụtụ mmehie gị, na ịzụ ahịa aghụghọ gị,
i meela ka ụlọnsọ gị niile ghọọ ihe rụrụ arụ.
Nʼihi ya, emere m ka ọkụ si nʼetiti gị pụta,
repịa gị.
Ka ị ghọọ ntụ nʼelu ala,
nʼihu ndị ahụ niile na-ele gị anya. 19Ndị niile maara gị
ka ihe ndị a juru anya,
nʼihi na ị ghọọla ihe oke egwu.
Ị laala nʼiyi ruo ebighị ebi.’ ” 20Okwu Onyenwe anyị ruru m ntị, sị, 21“Nwa nke mmadụ, chee ihu nʼebe Saịdọn dị buo amụma megide ya, 22ma kwuo, ‘Ihe ndị a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwuru,
“ ‘Mụ onwe m na-emegide gị, gị Saịdọn,
nʼetiti unu ka m ga-egosipụta otuto m.
Unu ga-amata na mụ onwe m bụ Onyenwe anyị
mgbe m mere ka ahụhụ dakwasị unu,
nʼime unu, a ga-anwapụta na m bụ onye dị nsọ.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.