Izikiel 28:19
Ezekiel 28:19 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ndị niile maara gị ka ihe ndị a juru anya, nʼihi na ị ghọọla ihe oke egwu. Ị laala nʼiyi ruo ebighị ebi.’ ”
Ezekiel 28:19 in English
Ezekiel 28:19 · Berean Standard Bible
All the nations who know you are appalled over you. You have come to a horrible end and will be no more.’”
Context
17Obi gị jupụtara na nganga
nʼihi ịma mma gị,
i mere ka amamihe gị
bụrụ ihe rụrụ arụ nʼihi ebube nke ịma mma gị.
Nʼihi ya, achụdara m gị, tụọ gị nʼala,
mee ka ị bụrụ ihe nlere anya nye ndị eze niile. 18Nʼihi ọtụtụ mmehie gị, na ịzụ ahịa aghụghọ gị,
i meela ka ụlọnsọ gị niile ghọọ ihe rụrụ arụ.
Nʼihi ya, emere m ka ọkụ si nʼetiti gị pụta,
repịa gị.
Ka ị ghọọ ntụ nʼelu ala,
nʼihu ndị ahụ niile na-ele gị anya. 19Ndị niile maara gị
ka ihe ndị a juru anya,
nʼihi na ị ghọọla ihe oke egwu.
Ị laala nʼiyi ruo ebighị ebi.’ ” 20Okwu Onyenwe anyị ruru m ntị, sị, 21“Nwa nke mmadụ, chee ihu nʼebe Saịdọn dị buo amụma megide ya,
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.