Izikiel 28:21
Ezekiel 28:21 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
“Nwa nke mmadụ, chee ihu nʼebe Saịdọn dị buo amụma megide ya,
Ezekiel 28:21 in English
Ezekiel 28:21 · Berean Standard Bible
“Son of man, set your face against Sidon and prophesy against her.
Context
19Ndị niile maara gị
ka ihe ndị a juru anya,
nʼihi na ị ghọọla ihe oke egwu.
Ị laala nʼiyi ruo ebighị ebi.’ ” 20Okwu Onyenwe anyị ruru m ntị, sị, 21“Nwa nke mmadụ, chee ihu nʼebe Saịdọn dị buo amụma megide ya, 22ma kwuo, ‘Ihe ndị a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwuru,
“ ‘Mụ onwe m na-emegide gị, gị Saịdọn,
nʼetiti unu ka m ga-egosipụta otuto m.
Unu ga-amata na mụ onwe m bụ Onyenwe anyị
mgbe m mere ka ahụhụ dakwasị unu,
nʼime unu, a ga-anwapụta na m bụ onye dị nsọ. 23Aga m ezite ajọ ọrịa na-efe efe, nke ga-emegide ya,
meekwa ka ọbara jupụta nʼokporoụzọ ya niile.
Ndị e gburu egbu ga-ada nʼime ya,
site na mma agha nke ga-abịakwasị ya nʼakụkụ niile.
Mgbe ahụ, ha ga-amata na mụ onwe m bụ Onyenwe anyị.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.