Izikiel 28:18
Ezekiel 28:18 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Nʼihi ọtụtụ mmehie gị, na ịzụ ahịa aghụghọ gị, i meela ka ụlọnsọ gị niile ghọọ ihe rụrụ arụ. Nʼihi ya, emere m ka ọkụ si nʼetiti gị pụta, repịa gị. Ka ị ghọọ ntụ nʼelu ala, nʼihu ndị ahụ niile na-ele gị anya.
Ezekiel 28:18 in English
Ezekiel 28:18 · Berean Standard Bible
By the multitude of your iniquities and the dishonesty of your trading you have profaned your sanctuaries. So I made fire come from within you, and it consumed you. I reduced you to ashes on the ground in the eyes of all who saw you.
Context
16Site nʼịba ụba nke ọzụzụ ahịa gị
ị ghọrọ onye na-eme ihe ike,
si otu a mehiekwa.
Nʼihi ya, esi m nʼugwu Chineke chụpụ gị, nʼihi adịghị nsọ gị.
Esitekwara m nʼetiti nkume ọkụ ndị ahụ chụpụ gị,
gị cherub na-ekpuchi ekpuchi. 17Obi gị jupụtara na nganga
nʼihi ịma mma gị,
i mere ka amamihe gị
bụrụ ihe rụrụ arụ nʼihi ebube nke ịma mma gị.
Nʼihi ya, achụdara m gị, tụọ gị nʼala,
mee ka ị bụrụ ihe nlere anya nye ndị eze niile. 18Nʼihi ọtụtụ mmehie gị, na ịzụ ahịa aghụghọ gị,
i meela ka ụlọnsọ gị niile ghọọ ihe rụrụ arụ.
Nʼihi ya, emere m ka ọkụ si nʼetiti gị pụta,
repịa gị.
Ka ị ghọọ ntụ nʼelu ala,
nʼihu ndị ahụ niile na-ele gị anya. 19Ndị niile maara gị
ka ihe ndị a juru anya,
nʼihi na ị ghọọla ihe oke egwu.
Ị laala nʼiyi ruo ebighị ebi.’ ” 20Okwu Onyenwe anyị ruru m ntị, sị,
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.