Izikiel 28:16
Ezekiel 28:16 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Site nʼịba ụba nke ọzụzụ ahịa gị ị ghọrọ onye na-eme ihe ike, si otu a mehiekwa. Nʼihi ya, esi m nʼugwu Chineke chụpụ gị, nʼihi adịghị nsọ gị. Esitekwara m nʼetiti nkume ọkụ ndị ahụ chụpụ gị, gị cherub na-ekpuchi ekpuchi.
Ezekiel 28:16 in English
Ezekiel 28:16 · Berean Standard Bible
By the vastness of your trade, you were filled with violence, and you sinned. So I drove you in disgrace from the mountain of God, and I banished you, O guardian cherub, from among the fiery stones.
Context
14Ahọpụtara m gị mee gị ka ị bụrụ cherub,
ọrụ ahụ e doro gị iche ịrụ.
Ọ bụ nʼugwu nsọ Chineke ka ị na-anọ,
na-ejegharịkwa nʼetiti nkume ndị ahụ na-acha ọkụ. 15Ị bụ onye na-enweghị ịta ụta
nʼụzọ gị niile site nʼụbọchị e kere gị,
tutu ruo mgbe a hụrụ ajọ omume nʼime gị. 16Site nʼịba ụba nke ọzụzụ ahịa gị
ị ghọrọ onye na-eme ihe ike,
si otu a mehiekwa.
Nʼihi ya, esi m nʼugwu Chineke chụpụ gị, nʼihi adịghị nsọ gị.
Esitekwara m nʼetiti nkume ọkụ ndị ahụ chụpụ gị,
gị cherub na-ekpuchi ekpuchi. 17Obi gị jupụtara na nganga
nʼihi ịma mma gị,
i mere ka amamihe gị
bụrụ ihe rụrụ arụ nʼihi ebube nke ịma mma gị.
Nʼihi ya, achụdara m gị, tụọ gị nʼala,
mee ka ị bụrụ ihe nlere anya nye ndị eze niile. 18Nʼihi ọtụtụ mmehie gị, na ịzụ ahịa aghụghọ gị,
i meela ka ụlọnsọ gị niile ghọọ ihe rụrụ arụ.
Nʼihi ya, emere m ka ọkụ si nʼetiti gị pụta,
repịa gị.
Ka ị ghọọ ntụ nʼelu ala,
nʼihu ndị ahụ niile na-ele gị anya.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.