Izikiel 28:15
Ezekiel 28:15 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ị bụ onye na-enweghị ịta ụta nʼụzọ gị niile site nʼụbọchị e kere gị, tutu ruo mgbe a hụrụ ajọ omume nʼime gị.
Ezekiel 28:15 in English
Ezekiel 28:15 · Berean Standard Bible
From the day you were created you were blameless in your ways— until wickedness was found in you.
Context
13Ị nọ nʼIden,
nʼubi Chineke a gbara ogige.
Nʼebe ahụ ka e ji nkume dị oke ọnụahịa ndị a chọọ gị mma,
rubi,* na topaazi, na emeralụdụ,
na krisolaịt, na ọniks, na jaspa,
na safaia, na tọkwọisi, na beril.
A rụnyere nkume ndị a niile nʼime ọlaedo.
Ọ bụkwa nʼụbọchị ahụ e kere gị ka e doziri ha. 14Ahọpụtara m gị mee gị ka ị bụrụ cherub,
ọrụ ahụ e doro gị iche ịrụ.
Ọ bụ nʼugwu nsọ Chineke ka ị na-anọ,
na-ejegharịkwa nʼetiti nkume ndị ahụ na-acha ọkụ. 15Ị bụ onye na-enweghị ịta ụta
nʼụzọ gị niile site nʼụbọchị e kere gị,
tutu ruo mgbe a hụrụ ajọ omume nʼime gị. 16Site nʼịba ụba nke ọzụzụ ahịa gị
ị ghọrọ onye na-eme ihe ike,
si otu a mehiekwa.
Nʼihi ya, esi m nʼugwu Chineke chụpụ gị, nʼihi adịghị nsọ gị.
Esitekwara m nʼetiti nkume ọkụ ndị ahụ chụpụ gị,
gị cherub na-ekpuchi ekpuchi. 17Obi gị jupụtara na nganga
nʼihi ịma mma gị,
i mere ka amamihe gị
bụrụ ihe rụrụ arụ nʼihi ebube nke ịma mma gị.
Nʼihi ya, achụdara m gị, tụọ gị nʼala,
mee ka ị bụrụ ihe nlere anya nye ndị eze niile.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.