Izikiel 28:14
Ezekiel 28:14 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ahọpụtara m gị mee gị ka ị bụrụ cherub, ọrụ ahụ e doro gị iche ịrụ. Ọ bụ nʼugwu nsọ Chineke ka ị na-anọ, na-ejegharịkwa nʼetiti nkume ndị ahụ na-acha ọkụ.
Ezekiel 28:14 in English
Ezekiel 28:14 · Berean Standard Bible
You were anointed as a guardian cherub, for I had ordained you. You were on the holy mountain of God; you walked among the fiery stones.
Context
12“Nwa nke mmadụ, bulie abụ akwa banyere eze Taịa ma gwa ya, ‘Ihe a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwuru,
“ ‘Gị onwe gị bụ akara izuoke,
ị jupụtara na amamihe na ịma mma. 13Ị nọ nʼIden,
nʼubi Chineke a gbara ogige.
Nʼebe ahụ ka e ji nkume dị oke ọnụahịa ndị a chọọ gị mma,
rubi,* na topaazi, na emeralụdụ,
na krisolaịt, na ọniks, na jaspa,
na safaia, na tọkwọisi, na beril.
A rụnyere nkume ndị a niile nʼime ọlaedo.
Ọ bụkwa nʼụbọchị ahụ e kere gị ka e doziri ha. 14Ahọpụtara m gị mee gị ka ị bụrụ cherub,
ọrụ ahụ e doro gị iche ịrụ.
Ọ bụ nʼugwu nsọ Chineke ka ị na-anọ,
na-ejegharịkwa nʼetiti nkume ndị ahụ na-acha ọkụ. 15Ị bụ onye na-enweghị ịta ụta
nʼụzọ gị niile site nʼụbọchị e kere gị,
tutu ruo mgbe a hụrụ ajọ omume nʼime gị. 16Site nʼịba ụba nke ọzụzụ ahịa gị
ị ghọrọ onye na-eme ihe ike,
si otu a mehiekwa.
Nʼihi ya, esi m nʼugwu Chineke chụpụ gị, nʼihi adịghị nsọ gị.
Esitekwara m nʼetiti nkume ọkụ ndị ahụ chụpụ gị,
gị cherub na-ekpuchi ekpuchi.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.