Izikiel 28:12
Ezekiel 28:12 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
“Nwa nke mmadụ, bulie abụ akwa banyere eze Taịa ma gwa ya, ‘Ihe a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwuru, “ ‘Gị onwe gị bụ akara izuoke, ị jupụtara na amamihe na ịma mma.
Ezekiel 28:12 in English
Ezekiel 28:12 · Berean Standard Bible
“Son of man, take up a lament for the king of Tyre and tell him that this is what the Lord GOD says: ‘You were the seal of perfection, full of wisdom and perfect in beauty.
Context
10Ị ga-anwụ ọnwụ dịka ndị a na-ebighị ugwu,
site nʼaka ndị ọbịa.
Mụ onwe m ekwuola, otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwubiri.’ ” 11Okwu nke Onyenwe anyị rutere m ntị, sị, 12“Nwa nke mmadụ, bulie abụ akwa banyere eze Taịa ma gwa ya, ‘Ihe a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwuru,
“ ‘Gị onwe gị bụ akara izuoke,
ị jupụtara na amamihe na ịma mma. 13Ị nọ nʼIden,
nʼubi Chineke a gbara ogige.
Nʼebe ahụ ka e ji nkume dị oke ọnụahịa ndị a chọọ gị mma,
rubi,* na topaazi, na emeralụdụ,
na krisolaịt, na ọniks, na jaspa,
na safaia, na tọkwọisi, na beril.
A rụnyere nkume ndị a niile nʼime ọlaedo.
Ọ bụkwa nʼụbọchị ahụ e kere gị ka e doziri ha. 14Ahọpụtara m gị mee gị ka ị bụrụ cherub,
ọrụ ahụ e doro gị iche ịrụ.
Ọ bụ nʼugwu nsọ Chineke ka ị na-anọ,
na-ejegharịkwa nʼetiti nkume ndị ahụ na-acha ọkụ.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.