Native Bible

Ezekiel 28:11 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Okwu nke Onyenwe anyị rutere m ntị, sị,

Ezekiel 28:11 in English

Ezekiel 28:11 · Berean Standard Bible

Again the word of the LORD came to me, saying,

Context

9Mgbe nke a mere, ị ga-asị, “Mụ onwe m bụ chi,” nʼihu ndị ahụ na-egbu gị? Ma gị onwe gị bụ mmadụ efu, ị bụghị chi, nʼaka ndị ahụ na-egbu gị. 10Ị ga-anwụ ọnwụ dịka ndị a na-ebighị ugwu, site nʼaka ndị ọbịa. Mụ onwe m ekwuola, otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwubiri.’ ” 11Okwu nke Onyenwe anyị rutere m ntị, sị, 12“Nwa nke mmadụ, bulie abụ akwa banyere eze Taịa ma gwa ya, ‘Ihe a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwuru, “ ‘Gị onwe gị bụ akara izuoke, ị jupụtara na amamihe na ịma mma. 13Ị nọ nʼIden, nʼubi Chineke a gbara ogige. Nʼebe ahụ ka e ji nkume dị oke ọnụahịa ndị a chọọ gị mma, rubi,* na topaazi, na emeralụdụ, na krisolaịt, na ọniks, na jaspa, na safaia, na tọkwọisi, na beril. A rụnyere nkume ndị a niile nʼime ọlaedo. Ọ bụkwa nʼụbọchị ahụ e kere gị ka e doziri ha.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.