Izikiel 28:11
Ezekiel 28:11 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Okwu nke Onyenwe anyị rutere m ntị, sị,
Ezekiel 28:11 in English
Ezekiel 28:11 · Berean Standard Bible
Again the word of the LORD came to me, saying,
Context
9Mgbe nke a mere, ị ga-asị, “Mụ onwe m bụ chi,”
nʼihu ndị ahụ na-egbu gị?
Ma gị onwe gị bụ mmadụ efu, ị bụghị chi,
nʼaka ndị ahụ na-egbu gị. 10Ị ga-anwụ ọnwụ dịka ndị a na-ebighị ugwu,
site nʼaka ndị ọbịa.
Mụ onwe m ekwuola, otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwubiri.’ ” 11Okwu nke Onyenwe anyị rutere m ntị, sị, 12“Nwa nke mmadụ, bulie abụ akwa banyere eze Taịa ma gwa ya, ‘Ihe a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwuru,
“ ‘Gị onwe gị bụ akara izuoke,
ị jupụtara na amamihe na ịma mma. 13Ị nọ nʼIden,
nʼubi Chineke a gbara ogige.
Nʼebe ahụ ka e ji nkume dị oke ọnụahịa ndị a chọọ gị mma,
rubi,* na topaazi, na emeralụdụ,
na krisolaịt, na ọniks, na jaspa,
na safaia, na tọkwọisi, na beril.
A rụnyere nkume ndị a niile nʼime ọlaedo.
Ọ bụkwa nʼụbọchị ahụ e kere gị ka e doziri ha.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.