Native Bible

Ezekiel 28:13 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ị nọ nʼIden, nʼubi Chineke a gbara ogige. Nʼebe ahụ ka e ji nkume dị oke ọnụahịa ndị a chọọ gị mma, rubi,* na topaazi, na emeralụdụ, na krisolaịt, na ọniks, na jaspa, na safaia, na tọkwọisi, na beril. A rụnyere nkume ndị a niile nʼime ọlaedo. Ọ bụkwa nʼụbọchị ahụ e kere gị ka e doziri ha.

Ezekiel 28:13 in English

Ezekiel 28:13 · Berean Standard Bible

You were in Eden, the garden of God. Every kind of precious stone adorned you:* ruby, topaz, and diamond, beryl, onyx, and jasper, sapphire,* turquoise, and emerald. Your mountings and settings were crafted in gold, prepared on the day of your creation.

Context

11Okwu nke Onyenwe anyị rutere m ntị, sị, 12“Nwa nke mmadụ, bulie abụ akwa banyere eze Taịa ma gwa ya, ‘Ihe a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwuru, “ ‘Gị onwe gị bụ akara izuoke, ị jupụtara na amamihe na ịma mma. 13Ị nọ nʼIden, nʼubi Chineke a gbara ogige. Nʼebe ahụ ka e ji nkume dị oke ọnụahịa ndị a chọọ gị mma, rubi,* na topaazi, na emeralụdụ, na krisolaịt, na ọniks, na jaspa, na safaia, na tọkwọisi, na beril. A rụnyere nkume ndị a niile nʼime ọlaedo. Ọ bụkwa nʼụbọchị ahụ e kere gị ka e doziri ha. 14Ahọpụtara m gị mee gị ka ị bụrụ cherub, ọrụ ahụ e doro gị iche ịrụ. Ọ bụ nʼugwu nsọ Chineke ka ị na-anọ, na-ejegharịkwa nʼetiti nkume ndị ahụ na-acha ọkụ. 15Ị bụ onye na-enweghị ịta ụta nʼụzọ gị niile site nʼụbọchị e kere gị, tutu ruo mgbe a hụrụ ajọ omume nʼime gị.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.