Izikiel 27:11
Ezekiel 27:11 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ndị ikom Avad, na Helek bụ ndị na-eche mgbidi gị nʼakụkụ niile. Ndị ikom Gamad na-eche nche nʼụlọ elu gị niile e wusiri ike. Ha konyekwara ọta ha nʼusoro na mgbidi gị, ime ka ịma mma gị zuo oke.
Ezekiel 27:11 in English
Ezekiel 27:11 · Berean Standard Bible
Men of Arvad and Helech manned your walls all around, and the men of Gammad were in your towers. They hung their shields around your walls; they perfected your beauty.
Context
9Ndị okenye na ndị nka Gebal a maara aha ha nọ nʼime ụgbọ mmiri gị.
Ọrụ ha bụ imechisi oghere ọbụla dị nʼụgbọ ahụ.
Ụgbọ mmiri niile na ndị na-anya ha
na-abata nʼọnụ mmiri gị nʼihi ịzụ ihe ahịa gị. 10“ ‘Ndị ikom Peshịa na Lidiya,* na Put,
jere gị ozi dịka ndị agha nʼusuu ndị agha gị.
Ha kokwasịrị ọta ha na okpu agha igwe ha nʼaja ụlọ gị,
na-ewetara gị ebube. 11Ndị ikom Avad, na Helek
bụ ndị na-eche mgbidi gị nʼakụkụ niile.
Ndị ikom Gamad
na-eche nche nʼụlọ elu gị niile e wusiri ike.
Ha konyekwara ọta ha nʼusoro na mgbidi gị,
ime ka ịma mma gị zuo oke. 12“ ‘Tashish bụ onye ahịa gị, nʼihi ịba ụba nke akụ gị. Ọ bụ ọlaọcha na igwe, na gbamgbam, na opu, ka ha ji akwụ gị ụgwọ ihe ha si nʼaka gị zụrụ. 13“ ‘Ndị Griis,* Tubal na Meshek, bụkwa ndị ahịa gị. Ha na-ebutere gị ndị ohu, na ihe e ji bronz kpụọ, iji kwụọ gị ụgwọ ihe ha si nʼaka gị zụrụ.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.