Izikiel 27:12
Ezekiel 27:12 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
“ ‘Tashish bụ onye ahịa gị, nʼihi ịba ụba nke akụ gị. Ọ bụ ọlaọcha na igwe, na gbamgbam, na opu, ka ha ji akwụ gị ụgwọ ihe ha si nʼaka gị zụrụ.
Ezekiel 27:12 in English
Ezekiel 27:12 · Berean Standard Bible
Tarshish was your merchant because of your great wealth of goods; they exchanged silver, iron, tin, and lead for your wares.
Context
10“ ‘Ndị ikom Peshịa na Lidiya,* na Put,
jere gị ozi dịka ndị agha nʼusuu ndị agha gị.
Ha kokwasịrị ọta ha na okpu agha igwe ha nʼaja ụlọ gị,
na-ewetara gị ebube. 11Ndị ikom Avad, na Helek
bụ ndị na-eche mgbidi gị nʼakụkụ niile.
Ndị ikom Gamad
na-eche nche nʼụlọ elu gị niile e wusiri ike.
Ha konyekwara ọta ha nʼusoro na mgbidi gị,
ime ka ịma mma gị zuo oke. 12“ ‘Tashish bụ onye ahịa gị, nʼihi ịba ụba nke akụ gị. Ọ bụ ọlaọcha na igwe, na gbamgbam, na opu, ka ha ji akwụ gị ụgwọ ihe ha si nʼaka gị zụrụ. 13“ ‘Ndị Griis,* Tubal na Meshek, bụkwa ndị ahịa gị. Ha na-ebutere gị ndị ohu, na ihe e ji bronz kpụọ, iji kwụọ gị ụgwọ ihe ha si nʼaka gị zụrụ. 14“ ‘Otu a kwa ndị ikom Bet Togama jikwa ịnyịnya ụgbọ, na ịnyịnya agha, na ịnyịnya ibu na-agbanwere* ihe ha zụrụ.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.