Izikiel 27:13
Ezekiel 27:13 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
“ ‘Ndị Griis,* Tubal na Meshek, bụkwa ndị ahịa gị. Ha na-ebutere gị ndị ohu, na ihe e ji bronz kpụọ, iji kwụọ gị ụgwọ ihe ha si nʼaka gị zụrụ.
Ezekiel 27:13 in English
Ezekiel 27:13 · Berean Standard Bible
Javan,* Tubal, and Meshech were your merchants. They exchanged slaves and bronze utensils for your merchandise.
Context
11Ndị ikom Avad, na Helek
bụ ndị na-eche mgbidi gị nʼakụkụ niile.
Ndị ikom Gamad
na-eche nche nʼụlọ elu gị niile e wusiri ike.
Ha konyekwara ọta ha nʼusoro na mgbidi gị,
ime ka ịma mma gị zuo oke. 12“ ‘Tashish bụ onye ahịa gị, nʼihi ịba ụba nke akụ gị. Ọ bụ ọlaọcha na igwe, na gbamgbam, na opu, ka ha ji akwụ gị ụgwọ ihe ha si nʼaka gị zụrụ. 13“ ‘Ndị Griis,* Tubal na Meshek, bụkwa ndị ahịa gị. Ha na-ebutere gị ndị ohu, na ihe e ji bronz kpụọ, iji kwụọ gị ụgwọ ihe ha si nʼaka gị zụrụ. 14“ ‘Otu a kwa ndị ikom Bet Togama jikwa ịnyịnya ụgbọ, na ịnyịnya agha, na ịnyịnya ibu na-agbanwere* ihe ha zụrụ. 15“ ‘Ndị ahịa si na Dedan bụkwa ndị ahịa gị. Otu a kwa ọtụtụ ndị bi nʼọnụ mmiri bụkwa ndị ahịa gị. Ha ji ọdụ, na osisi eboni kwụọ gị ụgwọ ihe ha zụrụ gị.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.