Izikiel 27:10
Ezekiel 27:10 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
“ ‘Ndị ikom Peshịa na Lidiya,* na Put, jere gị ozi dịka ndị agha nʼusuu ndị agha gị. Ha kokwasịrị ọta ha na okpu agha igwe ha nʼaja ụlọ gị, na-ewetara gị ebube.
Ezekiel 27:10 in English
Ezekiel 27:10 · Berean Standard Bible
Men of Persia, Lydia, and Put served as warriors in your army. They hung their shields and helmets on your walls; they gave you splendor.
Context
8Ndị ikom si Saịdọn na Avad bụ ndị na-akwọrọ gị ụgbọ mmiri gị.
Ndị ǹka ndị ikom gị, gị Taịa, nọ nʼụgbọ dịka ndị ọka nʼịkwọ ụgbọ mmiri. 9Ndị okenye na ndị nka Gebal a maara aha ha nọ nʼime ụgbọ mmiri gị.
Ọrụ ha bụ imechisi oghere ọbụla dị nʼụgbọ ahụ.
Ụgbọ mmiri niile na ndị na-anya ha
na-abata nʼọnụ mmiri gị nʼihi ịzụ ihe ahịa gị. 10“ ‘Ndị ikom Peshịa na Lidiya,* na Put,
jere gị ozi dịka ndị agha nʼusuu ndị agha gị.
Ha kokwasịrị ọta ha na okpu agha igwe ha nʼaja ụlọ gị,
na-ewetara gị ebube. 11Ndị ikom Avad, na Helek
bụ ndị na-eche mgbidi gị nʼakụkụ niile.
Ndị ikom Gamad
na-eche nche nʼụlọ elu gị niile e wusiri ike.
Ha konyekwara ọta ha nʼusoro na mgbidi gị,
ime ka ịma mma gị zuo oke. 12“ ‘Tashish bụ onye ahịa gị, nʼihi ịba ụba nke akụ gị. Ọ bụ ọlaọcha na igwe, na gbamgbam, na opu, ka ha ji akwụ gị ụgwọ ihe ha si nʼaka gị zụrụ.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.