Izikiel 27:9
Ezekiel 27:9 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ndị okenye na ndị nka Gebal a maara aha ha nọ nʼime ụgbọ mmiri gị. Ọrụ ha bụ imechisi oghere ọbụla dị nʼụgbọ ahụ. Ụgbọ mmiri niile na ndị na-anya ha na-abata nʼọnụ mmiri gị nʼihi ịzụ ihe ahịa gị.
Ezekiel 27:9 in English
Ezekiel 27:9 · Berean Standard Bible
The elders of Gebal were aboard as shipwrights, repairing your leaks. All the ships of the sea and their sailors came alongside to barter for your merchandise.
Context
7Ezi akwa ọcha a kpara nke ọma, nke e si Ijipt bubata,
ka e ji mee ọkọlọtọ gị.
Akwa ndo gị bụkwa akwa na-acha anụnụ anụnụ, na odo odo,
nke e si nʼobodo ọnụ mmiri Elisha bubata. 8Ndị ikom si Saịdọn na Avad bụ ndị na-akwọrọ gị ụgbọ mmiri gị.
Ndị ǹka ndị ikom gị, gị Taịa, nọ nʼụgbọ dịka ndị ọka nʼịkwọ ụgbọ mmiri. 9Ndị okenye na ndị nka Gebal a maara aha ha nọ nʼime ụgbọ mmiri gị.
Ọrụ ha bụ imechisi oghere ọbụla dị nʼụgbọ ahụ.
Ụgbọ mmiri niile na ndị na-anya ha
na-abata nʼọnụ mmiri gị nʼihi ịzụ ihe ahịa gị. 10“ ‘Ndị ikom Peshịa na Lidiya,* na Put,
jere gị ozi dịka ndị agha nʼusuu ndị agha gị.
Ha kokwasịrị ọta ha na okpu agha igwe ha nʼaja ụlọ gị,
na-ewetara gị ebube. 11Ndị ikom Avad, na Helek
bụ ndị na-eche mgbidi gị nʼakụkụ niile.
Ndị ikom Gamad
na-eche nche nʼụlọ elu gị niile e wusiri ike.
Ha konyekwara ọta ha nʼusoro na mgbidi gị,
ime ka ịma mma gị zuo oke.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.