Izikiel 27:7
Ezekiel 27:7 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ezi akwa ọcha a kpara nke ọma, nke e si Ijipt bubata, ka e ji mee ọkọlọtọ gị. Akwa ndo gị bụkwa akwa na-acha anụnụ anụnụ, na odo odo, nke e si nʼobodo ọnụ mmiri Elisha bubata.
Ezekiel 27:7 in English
Ezekiel 27:7 · Berean Standard Bible
Of embroidered fine linen from Egypt they made your sail, which served as your banner. Of blue and purple from the coasts of Elishah they made your awning.
Context
5Osisi e ji wuo ahụ ụgbọ gị
sitere nʼosisi junipa nke si Senia;
ọ bụkwa osisi sida nke si Lebanọn
ka e ji jidesie ihu ụgbọ ahụ ike. 6Osisi ook nke si Bashan
ka e ji mee ụmara gị niile.
Osisi e si Saiprọs bubata
ka e ji wuo ala ụgbọ gị, jirikwa ọdụ machie ya nʼọnọdụ ịchọ ya mma. 7Ezi akwa ọcha a kpara nke ọma, nke e si Ijipt bubata,
ka e ji mee ọkọlọtọ gị.
Akwa ndo gị bụkwa akwa na-acha anụnụ anụnụ, na odo odo,
nke e si nʼobodo ọnụ mmiri Elisha bubata. 8Ndị ikom si Saịdọn na Avad bụ ndị na-akwọrọ gị ụgbọ mmiri gị.
Ndị ǹka ndị ikom gị, gị Taịa, nọ nʼụgbọ dịka ndị ọka nʼịkwọ ụgbọ mmiri. 9Ndị okenye na ndị nka Gebal a maara aha ha nọ nʼime ụgbọ mmiri gị.
Ọrụ ha bụ imechisi oghere ọbụla dị nʼụgbọ ahụ.
Ụgbọ mmiri niile na ndị na-anya ha
na-abata nʼọnụ mmiri gị nʼihi ịzụ ihe ahịa gị.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.