Izikiel 27:6
Ezekiel 27:6 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Osisi ook nke si Bashan ka e ji mee ụmara gị niile. Osisi e si Saiprọs bubata ka e ji wuo ala ụgbọ gị, jirikwa ọdụ machie ya nʼọnọdụ ịchọ ya mma.
Ezekiel 27:6 in English
Ezekiel 27:6 · Berean Standard Bible
Of oaks from Bashan they made your oars; of wood from the coasts of Cyprus * they made your deck, inlaid with ivory.
Context
4I meela ka oke ala gị dịrị nʼetiti oke osimiri.
Ndị wuru gị emeekwala ka ịma mma gị zuo oke. 5Osisi e ji wuo ahụ ụgbọ gị
sitere nʼosisi junipa nke si Senia;
ọ bụkwa osisi sida nke si Lebanọn
ka e ji jidesie ihu ụgbọ ahụ ike. 6Osisi ook nke si Bashan
ka e ji mee ụmara gị niile.
Osisi e si Saiprọs bubata
ka e ji wuo ala ụgbọ gị, jirikwa ọdụ machie ya nʼọnọdụ ịchọ ya mma. 7Ezi akwa ọcha a kpara nke ọma, nke e si Ijipt bubata,
ka e ji mee ọkọlọtọ gị.
Akwa ndo gị bụkwa akwa na-acha anụnụ anụnụ, na odo odo,
nke e si nʼobodo ọnụ mmiri Elisha bubata. 8Ndị ikom si Saịdọn na Avad bụ ndị na-akwọrọ gị ụgbọ mmiri gị.
Ndị ǹka ndị ikom gị, gị Taịa, nọ nʼụgbọ dịka ndị ọka nʼịkwọ ụgbọ mmiri.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.