Izikiel 27:5
Ezekiel 27:5 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Osisi e ji wuo ahụ ụgbọ gị sitere nʼosisi junipa nke si Senia; ọ bụkwa osisi sida nke si Lebanọn ka e ji jidesie ihu ụgbọ ahụ ike.
Ezekiel 27:5 in English
Ezekiel 27:5 · Berean Standard Bible
They constructed all your planking with cypress * from Senir.* They took a cedar from Lebanon to make a mast for you.
Context
3sị ya, gị oke obodo dị nʼọnụ oke osimiri, onye bụ onye ahịa nke mba niile dị nʼọnụ osimiri. ‘Ihe ndị a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwuru:
“ ‘Gị onwe gị, bụ Taịa, na-asị,
“Ezuru m oke nʼịma mma.” 4I meela ka oke ala gị dịrị nʼetiti oke osimiri.
Ndị wuru gị emeekwala ka ịma mma gị zuo oke. 5Osisi e ji wuo ahụ ụgbọ gị
sitere nʼosisi junipa nke si Senia;
ọ bụkwa osisi sida nke si Lebanọn
ka e ji jidesie ihu ụgbọ ahụ ike. 6Osisi ook nke si Bashan
ka e ji mee ụmara gị niile.
Osisi e si Saiprọs bubata
ka e ji wuo ala ụgbọ gị, jirikwa ọdụ machie ya nʼọnọdụ ịchọ ya mma. 7Ezi akwa ọcha a kpara nke ọma, nke e si Ijipt bubata,
ka e ji mee ọkọlọtọ gị.
Akwa ndo gị bụkwa akwa na-acha anụnụ anụnụ, na odo odo,
nke e si nʼobodo ọnụ mmiri Elisha bubata.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.