Izikiel 27:4
Ezekiel 27:4 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
I meela ka oke ala gị dịrị nʼetiti oke osimiri. Ndị wuru gị emeekwala ka ịma mma gị zuo oke.
Ezekiel 27:4 in English
Ezekiel 27:4 · Berean Standard Bible
Your borders are in the heart of the seas; your builders perfected your beauty.
Context
2“Nwa nke mmadụ, bulie abụ akwa banyere Taịa, 3sị ya, gị oke obodo dị nʼọnụ oke osimiri, onye bụ onye ahịa nke mba niile dị nʼọnụ osimiri. ‘Ihe ndị a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwuru:
“ ‘Gị onwe gị, bụ Taịa, na-asị,
“Ezuru m oke nʼịma mma.” 4I meela ka oke ala gị dịrị nʼetiti oke osimiri.
Ndị wuru gị emeekwala ka ịma mma gị zuo oke. 5Osisi e ji wuo ahụ ụgbọ gị
sitere nʼosisi junipa nke si Senia;
ọ bụkwa osisi sida nke si Lebanọn
ka e ji jidesie ihu ụgbọ ahụ ike. 6Osisi ook nke si Bashan
ka e ji mee ụmara gị niile.
Osisi e si Saiprọs bubata
ka e ji wuo ala ụgbọ gị, jirikwa ọdụ machie ya nʼọnọdụ ịchọ ya mma.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.