Native Bible

Ezekiel 24:9 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

“ ‘Ya mere, ihe a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị na-ekwu, “ ‘Ahụhụ dịrị gị obodo ahụ na-awụsi ọbara. Mụ onwe m ga-akwanyekwa nkụ dị ukwuu nʼọkụ.

Ezekiel 24:9 in English

Ezekiel 24:9 · Berean Standard Bible

Yes, this is what the Lord GOD says: ‘Woe to the city of bloodshed! I, too, will pile the kindling high.

Context

7“ ‘Nʼihi na ọbara ọ wụsiri dị nʼetiti ya. Ọ bụkwa nʼelu nkume ka a wụsiri ya. Ọ bụghị nʼelu ala efu, ebe e nwere ike jiri aja kpochie ya. 8Ọ bụ nʼihi ikpali ọnụma na ịbọ ọbọ ka m ji hapụ ọbara ahụ nʼelu nkume, ebe a na-apụghị iji aja kpochie ya. 9“ ‘Ya mere, ihe a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị na-ekwu, “ ‘Ahụhụ dịrị gị obodo ahụ na-awụsi ọbara. Mụ onwe m ga-akwanyekwa nkụ dị ukwuu nʼọkụ. 10Chịkọtaanụ nkụ dị ukwuu, mụnyekwanụ ọkụ. Jirinụ ụda dị iche iche sizie anụ ahụ nke ọma; surekwaanụ ọkpụkpụ ya ọkụ. 11Sinyekwanụ ite ahụ ihe na-adịghị nʼime ya nʼọkụ, tutu ruo mgbe ọ nụrụ ọkụ, chagharịa, gbazee ihe niile na-abụghị ọla dị nʼime ya ga-asọpụtasị, nchara ya ga-agwụsịkwa.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.