Izikiel 24:9
Ezekiel 24:9 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
“ ‘Ya mere, ihe a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị na-ekwu, “ ‘Ahụhụ dịrị gị obodo ahụ na-awụsi ọbara. Mụ onwe m ga-akwanyekwa nkụ dị ukwuu nʼọkụ.
Ezekiel 24:9 in English
Ezekiel 24:9 · Berean Standard Bible
Yes, this is what the Lord GOD says: ‘Woe to the city of bloodshed! I, too, will pile the kindling high.
Context
7“ ‘Nʼihi na ọbara ọ wụsiri dị nʼetiti ya.
Ọ bụkwa nʼelu nkume ka a wụsiri ya.
Ọ bụghị nʼelu ala efu,
ebe e nwere ike jiri aja kpochie ya. 8Ọ bụ nʼihi ikpali ọnụma na ịbọ ọbọ
ka m ji hapụ ọbara ahụ nʼelu nkume,
ebe a na-apụghị iji aja kpochie ya. 9“ ‘Ya mere, ihe a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị na-ekwu,
“ ‘Ahụhụ dịrị gị obodo ahụ na-awụsi ọbara.
Mụ onwe m ga-akwanyekwa nkụ dị ukwuu nʼọkụ. 10Chịkọtaanụ nkụ dị ukwuu,
mụnyekwanụ ọkụ.
Jirinụ ụda dị iche iche
sizie anụ ahụ nke ọma;
surekwaanụ ọkpụkpụ ya ọkụ. 11Sinyekwanụ ite ahụ ihe na-adịghị nʼime ya nʼọkụ,
tutu ruo mgbe ọ nụrụ ọkụ, chagharịa,
gbazee ihe niile na-abụghị ọla dị nʼime ya ga-asọpụtasị,
nchara ya ga-agwụsịkwa.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.