Izikiel 24:11
Ezekiel 24:11 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Sinyekwanụ ite ahụ ihe na-adịghị nʼime ya nʼọkụ, tutu ruo mgbe ọ nụrụ ọkụ, chagharịa, gbazee ihe niile na-abụghị ọla dị nʼime ya ga-asọpụtasị, nchara ya ga-agwụsịkwa.
Ezekiel 24:11 in English
Ezekiel 24:11 · Berean Standard Bible
Set the empty pot on its coals until it becomes hot and its copper glows. Then its impurity will melt within; its rust will be consumed.
Context
9“ ‘Ya mere, ihe a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị na-ekwu,
“ ‘Ahụhụ dịrị gị obodo ahụ na-awụsi ọbara.
Mụ onwe m ga-akwanyekwa nkụ dị ukwuu nʼọkụ. 10Chịkọtaanụ nkụ dị ukwuu,
mụnyekwanụ ọkụ.
Jirinụ ụda dị iche iche
sizie anụ ahụ nke ọma;
surekwaanụ ọkpụkpụ ya ọkụ. 11Sinyekwanụ ite ahụ ihe na-adịghị nʼime ya nʼọkụ,
tutu ruo mgbe ọ nụrụ ọkụ, chagharịa,
gbazee ihe niile na-abụghị ọla dị nʼime ya ga-asọpụtasị,
nchara ya ga-agwụsịkwa. 12Ndọgbu nʼọrụ niile a emeghị ka nchara ahụ pụọ.
Ọ bụladị ọkụ dị ukwuu ahụ a kwanyere nʼokpuru ya
emeghị ka ọ gbazee. 13“ ‘Ugbu a, adịghị ọcha gị sitere na ndụ ọjọọ nke ịkwa iko gị. Nʼihi na m agbalịala ime ka ị dị ọcha, ma i kweghị adị ọcha site na mmerụ gị, ị gaghị adịkwa ọcha ọzọ tutu ruo mgbe ọnụma m megide gị zuruoke.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.