Izikiel 24:13
Ezekiel 24:13 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
“ ‘Ugbu a, adịghị ọcha gị sitere na ndụ ọjọọ nke ịkwa iko gị. Nʼihi na m agbalịala ime ka ị dị ọcha, ma i kweghị adị ọcha site na mmerụ gị, ị gaghị adịkwa ọcha ọzọ tutu ruo mgbe ọnụma m megide gị zuruoke.
Ezekiel 24:13 in English
Ezekiel 24:13 · Berean Standard Bible
Because of the indecency of your uncleanness I tried to cleanse you, but you would not be purified from your filthiness. You will not be pure again until My wrath against you has subsided.
Context
11Sinyekwanụ ite ahụ ihe na-adịghị nʼime ya nʼọkụ,
tutu ruo mgbe ọ nụrụ ọkụ, chagharịa,
gbazee ihe niile na-abụghị ọla dị nʼime ya ga-asọpụtasị,
nchara ya ga-agwụsịkwa. 12Ndọgbu nʼọrụ niile a emeghị ka nchara ahụ pụọ.
Ọ bụladị ọkụ dị ukwuu ahụ a kwanyere nʼokpuru ya
emeghị ka ọ gbazee. 13“ ‘Ugbu a, adịghị ọcha gị sitere na ndụ ọjọọ nke ịkwa iko gị. Nʼihi na m agbalịala ime ka ị dị ọcha, ma i kweghị adị ọcha site na mmerụ gị, ị gaghị adịkwa ọcha ọzọ tutu ruo mgbe ọnụma m megide gị zuruoke. 14“ ‘Mụ onwe m bụ Onyenwe anyị ekwuola ya. Oge m ji emezu ihe m kwuru eruola. Agaghị m ahapụ imezu ya. Agaghị m eme ebere maọbụ weghachi aka m azụ. A ga-ekpe gị ikpe dịka omume na obibi ndụ gị si dị. Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwubiri ya.’ ” 15Okwu Onyenwe anyị ruru m ntị, sị,
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.