Izikiel 24:12
Ezekiel 24:12 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ndọgbu nʼọrụ niile a emeghị ka nchara ahụ pụọ. Ọ bụladị ọkụ dị ukwuu ahụ a kwanyere nʼokpuru ya emeghị ka ọ gbazee.
Ezekiel 24:12 in English
Ezekiel 24:12 · Berean Standard Bible
It has frustrated every effort; its thick rust has not been removed, even by the fire.
Context
10Chịkọtaanụ nkụ dị ukwuu,
mụnyekwanụ ọkụ.
Jirinụ ụda dị iche iche
sizie anụ ahụ nke ọma;
surekwaanụ ọkpụkpụ ya ọkụ. 11Sinyekwanụ ite ahụ ihe na-adịghị nʼime ya nʼọkụ,
tutu ruo mgbe ọ nụrụ ọkụ, chagharịa,
gbazee ihe niile na-abụghị ọla dị nʼime ya ga-asọpụtasị,
nchara ya ga-agwụsịkwa. 12Ndọgbu nʼọrụ niile a emeghị ka nchara ahụ pụọ.
Ọ bụladị ọkụ dị ukwuu ahụ a kwanyere nʼokpuru ya
emeghị ka ọ gbazee. 13“ ‘Ugbu a, adịghị ọcha gị sitere na ndụ ọjọọ nke ịkwa iko gị. Nʼihi na m agbalịala ime ka ị dị ọcha, ma i kweghị adị ọcha site na mmerụ gị, ị gaghị adịkwa ọcha ọzọ tutu ruo mgbe ọnụma m megide gị zuruoke. 14“ ‘Mụ onwe m bụ Onyenwe anyị ekwuola ya. Oge m ji emezu ihe m kwuru eruola. Agaghị m ahapụ imezu ya. Agaghị m eme ebere maọbụ weghachi aka m azụ. A ga-ekpe gị ikpe dịka omume na obibi ndụ gị si dị. Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwubiri ya.’ ”
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.