Izikiel 24:10
Ezekiel 24:10 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Chịkọtaanụ nkụ dị ukwuu, mụnyekwanụ ọkụ. Jirinụ ụda dị iche iche sizie anụ ahụ nke ọma; surekwaanụ ọkpụkpụ ya ọkụ.
Ezekiel 24:10 in English
Ezekiel 24:10 · Berean Standard Bible
Pile on the logs and kindle the fire; cook the meat well and mix in the spices; let the bones be burned.
Context
8Ọ bụ nʼihi ikpali ọnụma na ịbọ ọbọ
ka m ji hapụ ọbara ahụ nʼelu nkume,
ebe a na-apụghị iji aja kpochie ya. 9“ ‘Ya mere, ihe a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị na-ekwu,
“ ‘Ahụhụ dịrị gị obodo ahụ na-awụsi ọbara.
Mụ onwe m ga-akwanyekwa nkụ dị ukwuu nʼọkụ. 10Chịkọtaanụ nkụ dị ukwuu,
mụnyekwanụ ọkụ.
Jirinụ ụda dị iche iche
sizie anụ ahụ nke ọma;
surekwaanụ ọkpụkpụ ya ọkụ. 11Sinyekwanụ ite ahụ ihe na-adịghị nʼime ya nʼọkụ,
tutu ruo mgbe ọ nụrụ ọkụ, chagharịa,
gbazee ihe niile na-abụghị ọla dị nʼime ya ga-asọpụtasị,
nchara ya ga-agwụsịkwa. 12Ndọgbu nʼọrụ niile a emeghị ka nchara ahụ pụọ.
Ọ bụladị ọkụ dị ukwuu ahụ a kwanyere nʼokpuru ya
emeghị ka ọ gbazee.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.