Izikiel 24:8
Ezekiel 24:8 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ọ bụ nʼihi ikpali ọnụma na ịbọ ọbọ ka m ji hapụ ọbara ahụ nʼelu nkume, ebe a na-apụghị iji aja kpochie ya.
Ezekiel 24:8 in English
Ezekiel 24:8 · Berean Standard Bible
In order to stir up wrath and take vengeance, I have placed her blood on the bare rock, so that it would not be covered.’
Context
6“ ‘Nʼihi na Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị sịrị,
“ ‘Ahụhụ dịrị obodo ahụ a na-awụsi ọbara nʼime ya.
E, ahụhụ dịrị ite ahụ nchara dị nʼime ya,
nke a na-apụghị ịsachapụ nchara ya.
Wepụtasịanụ ha nʼotu nʼotu.
Ka a hapụ ifekwa nza mgbe a na-eme nke a. 7“ ‘Nʼihi na ọbara ọ wụsiri dị nʼetiti ya.
Ọ bụkwa nʼelu nkume ka a wụsiri ya.
Ọ bụghị nʼelu ala efu,
ebe e nwere ike jiri aja kpochie ya. 8Ọ bụ nʼihi ikpali ọnụma na ịbọ ọbọ
ka m ji hapụ ọbara ahụ nʼelu nkume,
ebe a na-apụghị iji aja kpochie ya. 9“ ‘Ya mere, ihe a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị na-ekwu,
“ ‘Ahụhụ dịrị gị obodo ahụ na-awụsi ọbara.
Mụ onwe m ga-akwanyekwa nkụ dị ukwuu nʼọkụ. 10Chịkọtaanụ nkụ dị ukwuu,
mụnyekwanụ ọkụ.
Jirinụ ụda dị iche iche
sizie anụ ahụ nke ọma;
surekwaanụ ọkpụkpụ ya ọkụ.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.