Izikiel 24:7
Ezekiel 24:7 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
“ ‘Nʼihi na ọbara ọ wụsiri dị nʼetiti ya. Ọ bụkwa nʼelu nkume ka a wụsiri ya. Ọ bụghị nʼelu ala efu, ebe e nwere ike jiri aja kpochie ya.
Ezekiel 24:7 in English
Ezekiel 24:7 · Berean Standard Bible
For the blood she shed is still within her; she poured it out on the bare rock; she did not pour it on the ground to cover it with dust.
Context
5Werenụ naanị ndị kachasị mma na ndị ahọpụtara site nʼigwe ewu na atụrụ,
kwajuokwa nkụ nʼokpuru ya maka ọkpụkpụ ndị ahụ,
mee ya ka ọ gbọọ nke ọma,
sie ọkpụkpụ ndị ahụ nʼime ya. 6“ ‘Nʼihi na Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị sịrị,
“ ‘Ahụhụ dịrị obodo ahụ a na-awụsi ọbara nʼime ya.
E, ahụhụ dịrị ite ahụ nchara dị nʼime ya,
nke a na-apụghị ịsachapụ nchara ya.
Wepụtasịanụ ha nʼotu nʼotu.
Ka a hapụ ifekwa nza mgbe a na-eme nke a. 7“ ‘Nʼihi na ọbara ọ wụsiri dị nʼetiti ya.
Ọ bụkwa nʼelu nkume ka a wụsiri ya.
Ọ bụghị nʼelu ala efu,
ebe e nwere ike jiri aja kpochie ya. 8Ọ bụ nʼihi ikpali ọnụma na ịbọ ọbọ
ka m ji hapụ ọbara ahụ nʼelu nkume,
ebe a na-apụghị iji aja kpochie ya. 9“ ‘Ya mere, ihe a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị na-ekwu,
“ ‘Ahụhụ dịrị gị obodo ahụ na-awụsi ọbara.
Mụ onwe m ga-akwanyekwa nkụ dị ukwuu nʼọkụ.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.