Native Bible

Ezekiel 24:5 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Werenụ naanị ndị kachasị mma na ndị ahọpụtara site nʼigwe ewu na atụrụ, kwajuokwa nkụ nʼokpuru ya maka ọkpụkpụ ndị ahụ, mee ya ka ọ gbọọ nke ọma, sie ọkpụkpụ ndị ahụ nʼime ya.

Ezekiel 24:5 in English

Ezekiel 24:5 · Berean Standard Bible

Take the choicest of the flock and pile the fuel beneath it. Bring it to a boil and cook the bones in it.’

Context

3Ugbu a, tụọrọ ndị a na-enupu isi ilu a, gwa ha: ‘Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwuru: “ ‘Sikwasịnụ ite ahụ nʼọkụ; sikwasị ya kunyekwanụ mmiri nʼime ya. 4Tinyenụ anụ a bọrọ abọ nʼime ya. Tinye anụ dị mma, apata ya na aka ya. Tinyekwa ọkpụkpụ ndị ahụ dị mma nʼime ya. 5Werenụ naanị ndị kachasị mma na ndị ahọpụtara site nʼigwe ewu na atụrụ, kwajuokwa nkụ nʼokpuru ya maka ọkpụkpụ ndị ahụ, mee ya ka ọ gbọọ nke ọma, sie ọkpụkpụ ndị ahụ nʼime ya. 6“ ‘Nʼihi na Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị sịrị, “ ‘Ahụhụ dịrị obodo ahụ a na-awụsi ọbara nʼime ya. E, ahụhụ dịrị ite ahụ nchara dị nʼime ya, nke a na-apụghị ịsachapụ nchara ya. Wepụtasịanụ ha nʼotu nʼotu. Ka a hapụ ifekwa nza mgbe a na-eme nke a. 7“ ‘Nʼihi na ọbara ọ wụsiri dị nʼetiti ya. Ọ bụkwa nʼelu nkume ka a wụsiri ya. Ọ bụghị nʼelu ala efu, ebe e nwere ike jiri aja kpochie ya.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.