Izikiel 24:4
Ezekiel 24:4 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Tinyenụ anụ a bọrọ abọ nʼime ya. Tinye anụ dị mma, apata ya na aka ya. Tinyekwa ọkpụkpụ ndị ahụ dị mma nʼime ya.
Ezekiel 24:4 in English
Ezekiel 24:4 · Berean Standard Bible
Put in the pieces of meat, every good piece— thigh and shoulder— fill it with choice bones.
Context
2“Nwa nke mmadụ, detuo ụbọchị taa nʼakwụkwọ, nʼihi na ọ bụ taa ka eze Babilọn gbara Jerusalem gburugburu. 3Ugbu a, tụọrọ ndị a na-enupu isi ilu a, gwa ha: ‘Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwuru:
“ ‘Sikwasịnụ ite ahụ nʼọkụ; sikwasị ya
kunyekwanụ mmiri nʼime ya. 4Tinyenụ anụ a bọrọ abọ nʼime ya.
Tinye anụ dị mma, apata ya na aka ya.
Tinyekwa ọkpụkpụ ndị ahụ dị mma nʼime ya. 5Werenụ naanị ndị kachasị mma na ndị ahọpụtara site nʼigwe ewu na atụrụ,
kwajuokwa nkụ nʼokpuru ya maka ọkpụkpụ ndị ahụ,
mee ya ka ọ gbọọ nke ọma,
sie ọkpụkpụ ndị ahụ nʼime ya. 6“ ‘Nʼihi na Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị sịrị,
“ ‘Ahụhụ dịrị obodo ahụ a na-awụsi ọbara nʼime ya.
E, ahụhụ dịrị ite ahụ nchara dị nʼime ya,
nke a na-apụghị ịsachapụ nchara ya.
Wepụtasịanụ ha nʼotu nʼotu.
Ka a hapụ ifekwa nza mgbe a na-eme nke a.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.