Ọpụpụ 15:16
Exodus 15:16 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
oke egwu na oke ụjọ ejidela ha. Site nʼike nke aka gị, ha ga-anọ jụụ dịka nkume, tutu ruo mgbe ndị gị, Onyenwe anyị, gafechara, tutu ruo mgbe ndị gị, ndị ị zụtara nye onwe gị, gafechara.
Exodus 15:16 in English
Exodus 15:16 · Berean Standard Bible
and terror and dread will fall on them. By the power of Your arm they will be as still as a stone until Your people pass by, O LORD, until the people You have bought pass by.
Context
14Ụwa niile nụrụ ya, maa jijiji.
Ndị Filistia ka oke ihe mgbu bịakwasịrị. 15Ndị eze Edọm ga-anọ nʼọnọdụ obi ịlọ mmiri.
Ndị ndu Moab niile ga-abụ ndị ọma jijiji ga-ejidekwa,
ndị Kenan niile nʼọnọdụ ịtụ egwu ga-agbaze; 16oke egwu na oke ụjọ ejidela ha.
Site nʼike nke aka gị,
ha ga-anọ jụụ dịka nkume,
tutu ruo mgbe ndị gị, Onyenwe anyị, gafechara,
tutu ruo mgbe ndị gị, ndị ị zụtara nye onwe gị, gafechara. 17Gị onwe gị ga-akpọbata ha, kụọ ha dịka mkpụrụ,
nʼelu ugwu nke ihe nketa gị.
Nʼebe ahụ, Onyenwe anyị, i mere ka ọ bụrụ ebe obibi gị,
ebe nsọ ahụ, Onyenwe anyị, nke i ji aka gị tọọ ntọala ya. 18“Onyenwe anyị ga-abụ eze
ruo mgbe niile ebighị ebi.”
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.