Native Bible

Exodus 15:18 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

“Onyenwe anyị ga-abụ eze ruo mgbe niile ebighị ebi.”

Exodus 15:18 in English

Exodus 15:18 · Berean Standard Bible

The LORD will reign forever and ever!”

Context

16oke egwu na oke ụjọ ejidela ha. Site nʼike nke aka gị, ha ga-anọ jụụ dịka nkume, tutu ruo mgbe ndị gị, Onyenwe anyị, gafechara, tutu ruo mgbe ndị gị, ndị ị zụtara nye onwe gị, gafechara. 17Gị onwe gị ga-akpọbata ha, kụọ ha dịka mkpụrụ, nʼelu ugwu nke ihe nketa gị. Nʼebe ahụ, Onyenwe anyị, i mere ka ọ bụrụ ebe obibi gị, ebe nsọ ahụ, Onyenwe anyị, nke i ji aka gị tọọ ntọala ya. 18“Onyenwe anyị ga-abụ eze ruo mgbe niile ebighị ebi.” 19Mgbe ịnyịnya Fero, na ụgbọ agha ya, na ndị na-agba ịnyịnya, gbabanyere nʼosimiri, Onyenwe anyị mere ka mgbidi mmiri ahụ dagbuo ha. Ma ụmụ Izrel sitere nʼala mmiri kọrọ gafee. 20Nʼoge ahụ, Miriam onye amụma nwanyị, nwanne Erọn weere ịgba iti egwu nʼaka ya, duo ndị inyom ndị so ya, jiri ịgba egwu nke ha na-etekwa egwu.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.