Ọpụpụ 15:17
Exodus 15:17 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Gị onwe gị ga-akpọbata ha, kụọ ha dịka mkpụrụ, nʼelu ugwu nke ihe nketa gị. Nʼebe ahụ, Onyenwe anyị, i mere ka ọ bụrụ ebe obibi gị, ebe nsọ ahụ, Onyenwe anyị, nke i ji aka gị tọọ ntọala ya.
Exodus 15:17 in English
Exodus 15:17 · Berean Standard Bible
You will bring them in and plant them on the mountain of Your inheritance— the place, O LORD, You have prepared for Your dwelling, the sanctuary, O Lord, Your hands have established.
Context
15Ndị eze Edọm ga-anọ nʼọnọdụ obi ịlọ mmiri.
Ndị ndu Moab niile ga-abụ ndị ọma jijiji ga-ejidekwa,
ndị Kenan niile nʼọnọdụ ịtụ egwu ga-agbaze; 16oke egwu na oke ụjọ ejidela ha.
Site nʼike nke aka gị,
ha ga-anọ jụụ dịka nkume,
tutu ruo mgbe ndị gị, Onyenwe anyị, gafechara,
tutu ruo mgbe ndị gị, ndị ị zụtara nye onwe gị, gafechara. 17Gị onwe gị ga-akpọbata ha, kụọ ha dịka mkpụrụ,
nʼelu ugwu nke ihe nketa gị.
Nʼebe ahụ, Onyenwe anyị, i mere ka ọ bụrụ ebe obibi gị,
ebe nsọ ahụ, Onyenwe anyị, nke i ji aka gị tọọ ntọala ya. 18“Onyenwe anyị ga-abụ eze
ruo mgbe niile ebighị ebi.” 19Mgbe ịnyịnya Fero, na ụgbọ agha ya, na ndị na-agba ịnyịnya, gbabanyere nʼosimiri, Onyenwe anyị mere ka mgbidi mmiri ahụ dagbuo ha. Ma ụmụ Izrel sitere nʼala mmiri kọrọ gafee.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.