Ekiliziastis 5:14
Ecclesiastes 5:14 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
ma akụnụba ndị ahụ bụ ihe furu site nʼọdachi nke bụ na mgbe ha mụtara ụmụ, o nwekwaghị ihe fọdụrụ ụmụ ahụ iketa.
Ecclesiastes 5:14 in English
Ecclesiastes 5:14 · Berean Standard Bible
or wealth lost in a failed venture, so when that man has a son there is nothing to pass on.
Context
12Onye na-arụsị ọrụ ike na-arahụ ụra nke ọma,
ma o riri nri nta ma o rikwaranụ nke dị ukwuu,
ma oke iriju afọ onye ọgaranya
anaghị ekwe ya rahụ ụra. 13Ahụrụ m ihe ọjọọ ọzọ nʼokpuru anyanwụ,
mmadụ debere akụnụba ruo mgbe o wetara ya ihe mgbu, 14ma akụnụba ndị ahụ bụ ihe furu site nʼọdachi
nke bụ na mgbe ha mụtara ụmụ,
o nwekwaghị ihe fọdụrụ ụmụ ahụ iketa. 15Dịka mmadụ si gbara ọtọ site nʼafọ nne ya bata nʼụwa,
otu a ka anyị ga-esi hapụ ya.
O nweghị ihe ọ ga-ebu pụọ site na ndọgbu niile
ọ dọgburu onwe ya nʼọrụ. 16Ma nke a bụ ihe ọjọọ nke na-egbu mgbu nʼobi.
Mmadụ na-ala dịka o siri bịa.
Gịnị bụ uru ya,
mgbe ọ na-adọgbu onwe ya nʼọrụ nye ifufe?
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.