Native Bible

Ecclesiastes 5:14 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

ma akụnụba ndị ahụ bụ ihe furu site nʼọdachi nke bụ na mgbe ha mụtara ụmụ, o nwekwaghị ihe fọdụrụ ụmụ ahụ iketa.

Ecclesiastes 5:14 in English

Ecclesiastes 5:14 · Berean Standard Bible

or wealth lost in a failed venture, so when that man has a son there is nothing to pass on.

Context

12Onye na-arụsị ọrụ ike na-arahụ ụra nke ọma, ma o riri nri nta ma o rikwaranụ nke dị ukwuu, ma oke iriju afọ onye ọgaranya anaghị ekwe ya rahụ ụra. 13Ahụrụ m ihe ọjọọ ọzọ nʼokpuru anyanwụ, mmadụ debere akụnụba ruo mgbe o wetara ya ihe mgbu, 14ma akụnụba ndị ahụ bụ ihe furu site nʼọdachi nke bụ na mgbe ha mụtara ụmụ, o nwekwaghị ihe fọdụrụ ụmụ ahụ iketa. 15Dịka mmadụ si gbara ọtọ site nʼafọ nne ya bata nʼụwa, otu a ka anyị ga-esi hapụ ya. O nweghị ihe ọ ga-ebu pụọ site na ndọgbu niile ọ dọgburu onwe ya nʼọrụ. 16Ma nke a bụ ihe ọjọọ nke na-egbu mgbu nʼobi. Mmadụ na-ala dịka o siri bịa. Gịnị bụ uru ya, mgbe ọ na-adọgbu onwe ya nʼọrụ nye ifufe?

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.