Native Bible

Ecclesiastes 5:16 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ma nke a bụ ihe ọjọọ nke na-egbu mgbu nʼobi. Mmadụ na-ala dịka o siri bịa. Gịnị bụ uru ya, mgbe ọ na-adọgbu onwe ya nʼọrụ nye ifufe?

Ecclesiastes 5:16 in English

Ecclesiastes 5:16 · Berean Standard Bible

This too is a grievous evil: Exactly as a man is born, so he will depart. What does he gain as he toils for the wind?

Context

14ma akụnụba ndị ahụ bụ ihe furu site nʼọdachi nke bụ na mgbe ha mụtara ụmụ, o nwekwaghị ihe fọdụrụ ụmụ ahụ iketa. 15Dịka mmadụ si gbara ọtọ site nʼafọ nne ya bata nʼụwa, otu a ka anyị ga-esi hapụ ya. O nweghị ihe ọ ga-ebu pụọ site na ndọgbu niile ọ dọgburu onwe ya nʼọrụ. 16Ma nke a bụ ihe ọjọọ nke na-egbu mgbu nʼobi. Mmadụ na-ala dịka o siri bịa. Gịnị bụ uru ya, mgbe ọ na-adọgbu onwe ya nʼọrụ nye ifufe? 17Ụbọchị ndụ ya niile, ọ na-eri ihe nʼọchịchịrị, site oke mgbagwoju anya, na nsogbu na iwe. 18Ma achọpụtara m na ọ bụ ihe dị mma na ihe kwesiri omume, ka nwoke rie ihe ma ṅụọkwa ihe ọṅụṅụ Ka ọ chọtakwa afọ ojuju nʼime ndọgbu niile nke ọrụ ọ ruru nʼokpuru anyanwụ, nʼoge mkpụmkpụ ndụ nke Chineke nyere ya. Nʼihi na nke a bụ oke ya.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.