Ekiliziastis 5:15
Ecclesiastes 5:15 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Dịka mmadụ si gbara ọtọ site nʼafọ nne ya bata nʼụwa, otu a ka anyị ga-esi hapụ ya. O nweghị ihe ọ ga-ebu pụọ site na ndọgbu niile ọ dọgburu onwe ya nʼọrụ.
Ecclesiastes 5:15 in English
Ecclesiastes 5:15 · Berean Standard Bible
As a man came from his mother’s womb, so he will depart again, naked as he arrived. He takes nothing for his labor to carry in his hands.
Context
13Ahụrụ m ihe ọjọọ ọzọ nʼokpuru anyanwụ,
mmadụ debere akụnụba ruo mgbe o wetara ya ihe mgbu, 14ma akụnụba ndị ahụ bụ ihe furu site nʼọdachi
nke bụ na mgbe ha mụtara ụmụ,
o nwekwaghị ihe fọdụrụ ụmụ ahụ iketa. 15Dịka mmadụ si gbara ọtọ site nʼafọ nne ya bata nʼụwa,
otu a ka anyị ga-esi hapụ ya.
O nweghị ihe ọ ga-ebu pụọ site na ndọgbu niile
ọ dọgburu onwe ya nʼọrụ. 16Ma nke a bụ ihe ọjọọ nke na-egbu mgbu nʼobi.
Mmadụ na-ala dịka o siri bịa.
Gịnị bụ uru ya,
mgbe ọ na-adọgbu onwe ya nʼọrụ nye ifufe? 17Ụbọchị ndụ ya niile, ọ na-eri ihe nʼọchịchịrị,
site oke mgbagwoju anya, na nsogbu na iwe.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.