Ekiliziastis 5:18
Ecclesiastes 5:18 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ma achọpụtara m na ọ bụ ihe dị mma na ihe kwesiri omume, ka nwoke rie ihe ma ṅụọkwa ihe ọṅụṅụ Ka ọ chọtakwa afọ ojuju nʼime ndọgbu niile nke ọrụ ọ ruru nʼokpuru anyanwụ, nʼoge mkpụmkpụ ndụ nke Chineke nyere ya. Nʼihi na nke a bụ oke ya.
Ecclesiastes 5:18 in English
Ecclesiastes 5:18 · Berean Standard Bible
Here is what I have seen to be good and fitting: to eat and drink, and to find satisfaction in all the labor one does under the sun during the few days of life that God has given him—for this is his lot.
Context
16Ma nke a bụ ihe ọjọọ nke na-egbu mgbu nʼobi.
Mmadụ na-ala dịka o siri bịa.
Gịnị bụ uru ya,
mgbe ọ na-adọgbu onwe ya nʼọrụ nye ifufe? 17Ụbọchị ndụ ya niile, ọ na-eri ihe nʼọchịchịrị,
site oke mgbagwoju anya, na nsogbu na iwe. 18Ma achọpụtara m na ọ bụ ihe dị mma na ihe kwesiri omume, ka nwoke rie ihe ma ṅụọkwa ihe ọṅụṅụ Ka ọ chọtakwa afọ ojuju nʼime ndọgbu niile nke ọrụ ọ ruru nʼokpuru anyanwụ, nʼoge mkpụmkpụ ndụ nke Chineke nyere ya. Nʼihi na nke a bụ oke ya. 19Ọzọkwa, ọ bụrụ na Chineke enye mmadụ akụnụba na ihe nweta, ma nyekwa ya ike ọ ga-eji kporie ndụ nʼime ihe ndị a, ya nabata nke a dị ka oke ya ma were ọṅụ rụọ ọrụ ya. Ha bụ onyinye si nʼaka Chineke. 20Ebe ọ bụ na Chineke enyela ya obi ụtọ, ụbọchị ndụ ya ekwesighị iwetara ya oke echiche.
5:2 Ilu 20:25
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.