Ekiliziastis 5:19
Ecclesiastes 5:19 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ọzọkwa, ọ bụrụ na Chineke enye mmadụ akụnụba na ihe nweta, ma nyekwa ya ike ọ ga-eji kporie ndụ nʼime ihe ndị a, ya nabata nke a dị ka oke ya ma were ọṅụ rụọ ọrụ ya. Ha bụ onyinye si nʼaka Chineke.
Ecclesiastes 5:19 in English
Ecclesiastes 5:19 · Berean Standard Bible
Furthermore, God has given riches and wealth to every man, and He has enabled him to enjoy them, to accept his lot, and to rejoice in his labor. This is a gift from God.
Context
17Ụbọchị ndụ ya niile, ọ na-eri ihe nʼọchịchịrị,
site oke mgbagwoju anya, na nsogbu na iwe. 18Ma achọpụtara m na ọ bụ ihe dị mma na ihe kwesiri omume, ka nwoke rie ihe ma ṅụọkwa ihe ọṅụṅụ Ka ọ chọtakwa afọ ojuju nʼime ndọgbu niile nke ọrụ ọ ruru nʼokpuru anyanwụ, nʼoge mkpụmkpụ ndụ nke Chineke nyere ya. Nʼihi na nke a bụ oke ya. 19Ọzọkwa, ọ bụrụ na Chineke enye mmadụ akụnụba na ihe nweta, ma nyekwa ya ike ọ ga-eji kporie ndụ nʼime ihe ndị a, ya nabata nke a dị ka oke ya ma were ọṅụ rụọ ọrụ ya. Ha bụ onyinye si nʼaka Chineke. 20Ebe ọ bụ na Chineke enyela ya obi ụtọ, ụbọchị ndụ ya ekwesighị iwetara ya oke echiche.
5:2 Ilu 20:25
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.