Ekiliziastis 5:12
Ecclesiastes 5:12 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Onye na-arụsị ọrụ ike na-arahụ ụra nke ọma, ma o riri nri nta ma o rikwaranụ nke dị ukwuu, ma oke iriju afọ onye ọgaranya anaghị ekwe ya rahụ ụra.
Ecclesiastes 5:12 in English
Ecclesiastes 5:12 · Berean Standard Bible
The sleep of the worker is sweet, whether he eats little or much, but the abundance of the rich man permits him no sleep.
Context
10Onye ọbụla hụrụ ego nʼanya, ọ gaghị eju ya afọ.
Onye ọbụla hụrụ akụnụba nʼanya adịghị enwe afọ ojuju nʼihe ọbụla.
Nke a bụkwa ihe efu. 11Akụ na-abawanye,
ndị na-eri ya na-abawanyekwa.
Olee uru ha bara nye onyenwe ha
karịa iji anya ya abụọ na-ele ha? 12Onye na-arụsị ọrụ ike na-arahụ ụra nke ọma,
ma o riri nri nta ma o rikwaranụ nke dị ukwuu,
ma oke iriju afọ onye ọgaranya
anaghị ekwe ya rahụ ụra. 13Ahụrụ m ihe ọjọọ ọzọ nʼokpuru anyanwụ,
mmadụ debere akụnụba ruo mgbe o wetara ya ihe mgbu, 14ma akụnụba ndị ahụ bụ ihe furu site nʼọdachi
nke bụ na mgbe ha mụtara ụmụ,
o nwekwaghị ihe fọdụrụ ụmụ ahụ iketa.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.