Ekiliziastis 5:10
Ecclesiastes 5:10 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Onye ọbụla hụrụ ego nʼanya, ọ gaghị eju ya afọ. Onye ọbụla hụrụ akụnụba nʼanya adịghị enwe afọ ojuju nʼihe ọbụla. Nke a bụkwa ihe efu.
Ecclesiastes 5:10 in English
Ecclesiastes 5:10 · Berean Standard Bible
He who loves money is never satisfied by money, and he who loves wealth is never satisfied by income. This too is futile.
Context
8Ọ bụrụ na ị hụ ebe a na-emegbu ndị ogbenye, na-anapụkwa ha ihe ruru ha site nʼikpe ikpe na-ezighị ezi na mpaghara obodo a na-achị achị, ya ejula gị anya, nʼihi na onyeisi ọbụla nwere onye na-atụrụ ya. Ndịisi na-atụ iwu nwekwara ndị kachasị ha elu. Otu a kwa, ọ dịkwa ndị dị elu karịa ha. 9Mgbe ihe nnweta si nʼala ubi bara ụba, ọ na-abara onye ọbụla uru; ọ na-abakwara eze nʼonwe ya uru. 10Onye ọbụla hụrụ ego nʼanya, ọ gaghị eju ya afọ.
Onye ọbụla hụrụ akụnụba nʼanya adịghị enwe afọ ojuju nʼihe ọbụla.
Nke a bụkwa ihe efu. 11Akụ na-abawanye,
ndị na-eri ya na-abawanyekwa.
Olee uru ha bara nye onyenwe ha
karịa iji anya ya abụọ na-ele ha? 12Onye na-arụsị ọrụ ike na-arahụ ụra nke ọma,
ma o riri nri nta ma o rikwaranụ nke dị ukwuu,
ma oke iriju afọ onye ọgaranya
anaghị ekwe ya rahụ ụra.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.