Native Bible

Ecclesiastes 5:11 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Akụ na-abawanye, ndị na-eri ya na-abawanyekwa. Olee uru ha bara nye onyenwe ha karịa iji anya ya abụọ na-ele ha?

Ecclesiastes 5:11 in English

Ecclesiastes 5:11 · Berean Standard Bible

When good things increase, so do those who consume them; what then is the profit to the owner, except to behold them with his eyes?

Context

9Mgbe ihe nnweta si nʼala ubi bara ụba, ọ na-abara onye ọbụla uru; ọ na-abakwara eze nʼonwe ya uru. 10Onye ọbụla hụrụ ego nʼanya, ọ gaghị eju ya afọ. Onye ọbụla hụrụ akụnụba nʼanya adịghị enwe afọ ojuju nʼihe ọbụla. Nke a bụkwa ihe efu. 11Akụ na-abawanye, ndị na-eri ya na-abawanyekwa. Olee uru ha bara nye onyenwe ha karịa iji anya ya abụọ na-ele ha? 12Onye na-arụsị ọrụ ike na-arahụ ụra nke ọma, ma o riri nri nta ma o rikwaranụ nke dị ukwuu, ma oke iriju afọ onye ọgaranya anaghị ekwe ya rahụ ụra. 13Ahụrụ m ihe ọjọọ ọzọ nʼokpuru anyanwụ, mmadụ debere akụnụba ruo mgbe o wetara ya ihe mgbu,

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.