Ekiliziastis 4:11
Ecclesiastes 4:11 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ọzọ, ọ bụrụ na mmadụ abụọ edinakọ, ahụ ga-ekpokwa ha ọkụ, ma olee otu onye naanị ya dina ga-esi nweta okpomọkụ?
Ecclesiastes 4:11 in English
Ecclesiastes 4:11 · Berean Standard Bible
Again, if two lie down together, they will keep warm; but how can one keep warm alone?
Context
9Mmadụ abụọ ka mma karịa otu onye,
nʼihi na ha ga-arụpụta ọtụtụ ihe: 10Otu onye nʼime ha daa,
onye nke ọzọ ga-apalite ya.
Ma mgbe ọ bụ naanị otu onye,
onye ga-apalite ya? Ọ nọ nʼime nsogbu. 11Ọzọ, ọ bụrụ na mmadụ abụọ edinakọ, ahụ ga-ekpokwa ha ọkụ,
ma olee otu onye naanị ya dina ga-esi nweta okpomọkụ? 12Ọ bụ ezie na e nwere ike merie onye naanị ya guzo,
ma mmadụ abụọ pụrụ iguzo zọọ onwe ha.
Ụdọ e ji eriri atọ tụkọta nʼotu, adịghị adọbi ya ngwangwa. 13Ọ ka mma ịbụ nwantakịrị na onye ogbenye nwere nghọta karịa ịbụ agadi bụ eze ndị nzuzu, onye na-adịghị aṅa ntị na ndụmọdụ ọbụla.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.