Ekiliziastis 4:12
Ecclesiastes 4:12 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ọ bụ ezie na e nwere ike merie onye naanị ya guzo, ma mmadụ abụọ pụrụ iguzo zọọ onwe ha. Ụdọ e ji eriri atọ tụkọta nʼotu, adịghị adọbi ya ngwangwa.
Ecclesiastes 4:12 in English
Ecclesiastes 4:12 · Berean Standard Bible
And though one may be overpowered, two can resist. Moreover, a cord of three strands is not quickly broken.
Context
10Otu onye nʼime ha daa,
onye nke ọzọ ga-apalite ya.
Ma mgbe ọ bụ naanị otu onye,
onye ga-apalite ya? Ọ nọ nʼime nsogbu. 11Ọzọ, ọ bụrụ na mmadụ abụọ edinakọ, ahụ ga-ekpokwa ha ọkụ,
ma olee otu onye naanị ya dina ga-esi nweta okpomọkụ? 12Ọ bụ ezie na e nwere ike merie onye naanị ya guzo,
ma mmadụ abụọ pụrụ iguzo zọọ onwe ha.
Ụdọ e ji eriri atọ tụkọta nʼotu, adịghị adọbi ya ngwangwa. 13Ọ ka mma ịbụ nwantakịrị na onye ogbenye nwere nghọta karịa ịbụ agadi bụ eze ndị nzuzu, onye na-adịghị aṅa ntị na ndụmọdụ ọbụla. 14Nwata dị otu a, ma eleghị anya, ọ ga-esi nʼụlọ mkpọrọ pụta bụrụ eze, ma ọ bụkwanụ na a mụrụ ya ogbenye nʼalaeze ahụ.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.