Native Bible

Ecclesiastes 4:10 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Otu onye nʼime ha daa, onye nke ọzọ ga-apalite ya. Ma mgbe ọ bụ naanị otu onye, onye ga-apalite ya? Ọ nọ nʼime nsogbu.

Ecclesiastes 4:10 in English

Ecclesiastes 4:10 · Berean Standard Bible

For if one falls down, his companion can lift him up; but pity the one who falls without another to help him up!

Context

8Ọ dị otu nwoke nke naanị ya nọ, o nweghị nwa, o nwekwaghị ụmụnne. Mgbe niile, ọ na-adọgbu onwe ya nʼọrụ, ma nke a emeghị ka afọ ju ya nʼakụnụba o nwere. Ọ jụrụ sị, “Ọ bụ nʼihi onye ka m ji adọgbu onwe m nʼọrụ,” “nʼihi gịnị ka m ji anapụ onwe m ihe obi aṅụrị?” Ihe nke a enweghị isi, ihe efu na-eweta obi mgbawa ka ha bụ. 9Mmadụ abụọ ka mma karịa otu onye, nʼihi na ha ga-arụpụta ọtụtụ ihe: 10Otu onye nʼime ha daa, onye nke ọzọ ga-apalite ya. Ma mgbe ọ bụ naanị otu onye, onye ga-apalite ya? Ọ nọ nʼime nsogbu. 11Ọzọ, ọ bụrụ na mmadụ abụọ edinakọ, ahụ ga-ekpokwa ha ọkụ, ma olee otu onye naanị ya dina ga-esi nweta okpomọkụ? 12Ọ bụ ezie na e nwere ike merie onye naanị ya guzo, ma mmadụ abụọ pụrụ iguzo zọọ onwe ha. Ụdọ e ji eriri atọ tụkọta nʼotu, adịghị adọbi ya ngwangwa.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.