Ekiliziastis 4:9
Ecclesiastes 4:9 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Mmadụ abụọ ka mma karịa otu onye, nʼihi na ha ga-arụpụta ọtụtụ ihe:
Ecclesiastes 4:9 in English
Ecclesiastes 4:9 · Berean Standard Bible
Two are better than one, because they have a good return for their labor.
Context
7Ọ dịkwa ihe ọzọ m hụrụ nʼokpuru anyanwụ bụ naanị ihe efu. 8Ọ dị otu nwoke nke naanị ya nọ,
o nweghị nwa, o nwekwaghị ụmụnne.
Mgbe niile, ọ na-adọgbu onwe ya nʼọrụ,
ma nke a emeghị ka afọ ju ya nʼakụnụba o nwere.
Ọ jụrụ sị, “Ọ bụ nʼihi onye ka m ji adọgbu onwe m nʼọrụ,”
“nʼihi gịnị ka m ji anapụ onwe m ihe obi aṅụrị?”
Ihe nke a enweghị isi,
ihe efu na-eweta obi mgbawa ka ha bụ. 9Mmadụ abụọ ka mma karịa otu onye,
nʼihi na ha ga-arụpụta ọtụtụ ihe: 10Otu onye nʼime ha daa,
onye nke ọzọ ga-apalite ya.
Ma mgbe ọ bụ naanị otu onye,
onye ga-apalite ya? Ọ nọ nʼime nsogbu. 11Ọzọ, ọ bụrụ na mmadụ abụọ edinakọ, ahụ ga-ekpokwa ha ọkụ,
ma olee otu onye naanị ya dina ga-esi nweta okpomọkụ?
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.