Ekiliziastis 4:13
Ecclesiastes 4:13 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ọ ka mma ịbụ nwantakịrị na onye ogbenye nwere nghọta karịa ịbụ agadi bụ eze ndị nzuzu, onye na-adịghị aṅa ntị na ndụmọdụ ọbụla.
Ecclesiastes 4:13 in English
Ecclesiastes 4:13 · Berean Standard Bible
Better is a poor but wise youth than an old but foolish king who no longer knows how to take a warning.
Context
11Ọzọ, ọ bụrụ na mmadụ abụọ edinakọ, ahụ ga-ekpokwa ha ọkụ,
ma olee otu onye naanị ya dina ga-esi nweta okpomọkụ? 12Ọ bụ ezie na e nwere ike merie onye naanị ya guzo,
ma mmadụ abụọ pụrụ iguzo zọọ onwe ha.
Ụdọ e ji eriri atọ tụkọta nʼotu, adịghị adọbi ya ngwangwa. 13Ọ ka mma ịbụ nwantakịrị na onye ogbenye nwere nghọta karịa ịbụ agadi bụ eze ndị nzuzu, onye na-adịghị aṅa ntị na ndụmọdụ ọbụla. 14Nwata dị otu a, ma eleghị anya, ọ ga-esi nʼụlọ mkpọrọ pụta bụrụ eze, ma ọ bụkwanụ na a mụrụ ya ogbenye nʼalaeze ahụ. 15Ahụrụ m na mmadụ niile ndị bi nʼokpuru anyanwụ na-eso nwantakịrị ahụ onye nọchiri anya eze.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.