Ekiliziastis 2:15
Ecclesiastes 2:15 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Agwara m onwe m okwu sị, “Dịka onye nzuzu ga-anwụ, otu ahụ kwa ka m ga-anwụ. Gịnị bụ uru amamihe m niile bara?” Ekwuru m nʼobi m sị, “Ihe a bụkwa ihe efu.
Ecclesiastes 2:15 in English
Ecclesiastes 2:15 · Berean Standard Bible
So I said to myself, “The fate of the fool will also befall me. What then have I gained by being wise?” And I said to myself that this too is futile.
Context
13Achọpụtara m na amamihe dị mma karịa nzuzu,
dịka ìhè si dị mma karịa ọchịchịrị. 14Nʼihi na onye maara ihe na-ahụ ụzọ
ma isi kpuru onye nzuzu.
Ma achọpụtakwara m
na otu ihe ndaba na-adabara onye amamihe na onye nzuzu. 15Agwara m onwe m okwu sị,
“Dịka onye nzuzu ga-anwụ, otu ahụ kwa ka m ga-anwụ.
Gịnị bụ uru amamihe m niile bara?”
Ekwuru m nʼobi m sị,
“Ihe a bụkwa ihe efu. 16Nʼihi na onye maara ihe na onye nzuzu bụ ndị a na-agaghị echeta ihe banyere ogologo oge dị nʼihu.
Nʼụbọchị ndị na-abịa nʼihu, a gaghị echeta ha.
Onye amamihe na onye nzuzu aghaghị ịnwụ.” 17Ya mere, akpọrọ m ịdị ndụ asị, nʼihi na ọrụ a na-arụ nʼokpuru anyanwụ wutere m. Ihe efu ka ọ bụ; ọ dị ka ịchụgharị ifufe.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.